Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Habakuk 1:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru.

2. Jehova, rùe ole mb͕e ka m'ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m'nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa.

3. N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.

4. N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.

5. Hunu n'etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n'ihi na ọlu ka M'nālu n'ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.

6. N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.

7. Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n'aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa.

8. Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Habakuk 1