isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Habakuk 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọhu nke Habakuk, bú onye-amuma, huru.

2. Jehova, rùe ole mb͕e ka m'ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m'nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa.

3. N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.

4. N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.

5. Hunu n'etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n'ihi na ọlu ka M'nālu n'ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.

6. N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.

7. Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n'aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa.

8. Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.

9. Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá.

10. E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n'ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.

11. Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.

12. Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.

13. Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;

14. I we me madu ka ha di ka azù nke oké osimiri, dika ihe nākpu akpu, nke nēnweghi onye nāchi ha?

15. Ha nile ka o ji nkò-azù dọkpuru, o nēkpochapu ha n'eriri-ya, chikọta ha n'ub͕u-ya: n'ihi nka ka ọ nāṅuri, tegharia egwú ọṅù.

16. N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.

17. Ọ̀ gēwere n'ihi nka nāwupu eriri-ya, ghara inwe ọmiko n'ib͕u mba di iche iche mb͕e dum?