Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 7:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,

2. nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub,

3. nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot,

4. nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki,

5. nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:

6. Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.

7. Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.

8. O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze.

9. N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya.

10. N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel.

11. Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.

12. Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 7