Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 6:15-18 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.

16. Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n'umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke.

17. Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di.

18. Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 6