Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 6:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.

14. Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu.

15. Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.

16. Umu Israel, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi fọduru n'umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, were ọṅù me ememe nke irara ulo a nke Chineke nye Chineke.

17. Ha we weta nso n'irara ulo a nke Chineke nye Chineke ọgu oke-ehi ise, na ọgu ebulu iri, na nnù umu-aturu; na nkpi iri-na-abua, iji churu Israel nile àjà-nmehie, dika nguta nke ebo nile nke Israel si di.

18. Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.

19. Umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa mbu.

20. N'ihi na ndi-nchu-àjà na ndi Livai mere onwe-ha ka ha di ọcha n'otù; ha nile di ọcha: ha we b͕uere umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ anu ngabiga, b͕u-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà, b͕u-kwa-ra onwe-ha.

21. Umu Israel we rie, bú ndi nēsi n'etiti ndi emere ka ha je birl n'ala ọzọ lata, ha na onye ọ bula nke nēkewapu onwe-ya n'ọrurú nke mba nile nke ala ahu iso ha, ichọ Jehova, bú Chineke Israel,

22. ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 6