Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezra 6:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n'ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon.

2. Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n'Ekbatar, n'ulo uku nke di n'ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a.

3. N'arọ mbu nke Sairọs, bú eze, Sairọs, bú eze, nyere iwu; Ulo Chineke nime Jerusalem, ka ewue ulo ahu, bú ebe ha nāchu àjà, ka atọ kwa ntọ-ala-ya si-ike; idi-elu-ya gādi ọgu cubit atọ, obosara-ya ọgu cubit atọ;

4. akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n'ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu:

5. ọzọ kwa, ka enyeghachi ihe ọla-edo na ọla-ọcha nke ulo Chineke, bú nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, chita na Babilon, ka achighachi kwa ha n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem, ihe ọ bula n'ọnọdu-ya, gi dọba kwa ha n'ulo Chineke.

6. Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu:

7. rapunu ọlu ulo a nke Chineke; kwe ka onye-isi ndi-Ju na ndi-okenye ndi-Ju wue ulo a nke Chineke n'ọnọdu-ya.

8. Anēsite kwa n'akam nye iwu bayere ihe unu gēme ndi-okenye ahu nke ndi-Ju iwu ulo a nke Chineke: ka eme ngwa si n'àkù eze, bú nke sitere n'utu anātu n'ofè osimiri, nye ndikom ahu ego iji lu ọlu ahu, ka ha ghara ikwusi.

9. Ihe di kwa ha nkpà, ma umu-oke-ehi, ma ebulu, ma umu-aturu, iji churu Chineke nke elu-igwe àjà-nsure-ọku, ma ọka wheat, ma nnú, ma manya-vine, ma manu, dika okwu-ọnu ndi-nchu-àjà si di, bú ndi nọ na Jerusalem, ka ewere ya nye ha kwa-ubọchi nēmehiegh:

10. ka ha we nēweta nso ihe ísì utọ nye Chineke nke elu-igwe, nēkpe kwa ekpere bayere ndu eze, na nke umu-ya ndikom.

11. Anēsite kwa n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke gāb͕anwe okwu a, ka adọputa osisi n'ulo-ya, bulie onye ahu kpọgide ya n'elu ya; ka eme kwa ulo-ya ebe-ikpofu-ahihia n'ihi nka:

12. Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.

13. Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.

14. Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu.

15. Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezra 6