Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 8:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.

2. M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.

3. O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.

4. Ma, le, n'ebe ahu ka ebube nke Chineke nke Israel di, dika ihe-ọhuhu ahu nke m'huru na ndagwurugwu.

5. O we sim, Nwa nke madu, biko, welie anya-gi le n'uzọ Ugwu. M'we welie anyam abua le n'uzọ Ugwu, ma, le, n'akuku Ugwu nke ọnu-uzọ-ama nke ebe-ichu-àjà ka ihe-oyiyi a nke ekworo di nime nbata.

6. O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.

7. O we me ka m'biarue ọnu-uzọ ogige ahu; m'we hu, ma, le, otù oghere di na mb͕idi ogige.

8. O we sim, Nwa nke madu, biko, gwue na mb͕idi a: m'we gwue na mb͕idi ahu, ma, le, otù ọnu-uzọ.

9. O we sim, Ba, hu ihe-árú ọjọ nile nke ha onwe-ha nēme n'ebe a.

10. M'we ba, hu; ma, le, udi nile ọ bula nke ihe nākpu akpu, na anumanu nke bu ihe-árú, na arusi nile nke ulo Israel, di, akàra na mb͕idi ahu buruburu n'ebe nile.

11. Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n'iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n'etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 8