Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 7:16-27 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma ndi-ha b͕apuru ab͕apu gāb͕apu, nọ n'ugwu nile dika nduru nke ndagwurugwu, ha nile nēkwo ákwá, onye ọ bula n'ajọ omume-ya.

17. Aka nile gākuda, ikperè nile gābu nání miri miri.

18. Ha gēke kwa ákwà-nkpe n'úkwù-ha, oké ọma-jijiji gēkpuchi kwa ha; ọ bu kwa iru nile ka ihere gēme, n'isi nile ha ka nkwọcha-isi gādi kwa.

19. Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n'èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n'ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo.

20. Ma ima-nma nke ihe-ichọ-nma-ya, na nbili-elu ka o doro ya: ma onyinyo di iche iche nke ihe-árú nile ha na nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha ka ha mere nime ya: n'ihi nka ka M'meworo ya ka ọ ghọrọ ha ihe-isọ-nsọ.

21. M'gēnye kwa ya n'aka ndi ala ọzọ ibu ihe-nluta-n'agha, M'gēwere kwa ya nye ndi-nmebi-iwu nke uwa ibu ihe-nkwata; ha gēmeru kwa ya.

22. M'gēsi kwa n'ebe ha nọ chigharia irum, ha gēme kwa ka ebe-nzuzom ghara idi nsọ: ndi nēme ihe-ike gābà kwa nime ya, me ka ọ ghara idi nsọ.

23. Me iyab͕a ahu: n'ihi na ala ahu juputara n'ikpé ọbara, obodo ahu juputa-kwa-ra n'ihe-ike.

24. M'gēme kwa ka ndi ọjọ nke mba di iche iche bia, ha ewe nweta ulo nile ha: M'gēme kwa ka npako nke ndi di ike kwusi; agēme kwa ka ebe nsọ nile ha ghara idi nsọ.

25. Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi.

26. Nbibi gēsochi nbibi bia, akukọ gānọchi kwa akukọ; ha gāchọ kwa ọhù n'aka onye-amuma; ma iwu gālanari onye-nchu-àjà n'iyì, ndum-ọdu gālanari kwa ndi-okenye n'iyì.

27. Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n'efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M'gēme ha, M'gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 7