Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 48:14-28 Bible Nso (IGBOB)

14. Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n'ebe ọzọ: n'ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova.

15. Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n'obosara-ya, n'iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n'etiti ya.

16. Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n'akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise.

17. Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n'akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n'akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri.

18. Ma nke fọduru n'ogologo-ya, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n'akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n'akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri.

19. Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n'ebo nile nke Israel.

20. Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo.

21. Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya.

22. Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.

23. Ma ebo nile nke fọduru: site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè.

24. N'akuku ókè-ala Benjamin, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè.

25. N'akuku ókè-ala Simeon, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè.

26. N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè.

27. N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.

28. Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 48