Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 47:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.

2. O we me ka m'si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n'akuku Ugwu puta, o we me ka m'ga buruburu n'uzọ di n'èzí rue ọnu-uzọ-ama di n'èzí, n'uzọ nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n'akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà.

3. Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.

4. O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m'gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù.

5. O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m'nāpughi igabiga: n'ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga.

6. O we sim, Ì huwo nka, nwa nke madu? O we me ka m'je, ọ we me ka m'laghachi n'usọ osimiri ahu.

7. Mb͕e m'laghachiri, le, n'usọ osimiri ahu ka ọtutu osisi nke bara uba nke-uku di, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

8. O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.

9. Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n'ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n'ihi na miri ndia eruwo n'ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n'ebe osimiri ahu gērute.

10. Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.

11. Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 47