Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 40:9-24 Bible Nso (IGBOB)

9. O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo.

10. Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

11. O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;

12. na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ.

13. O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.

14. O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.

15. Ọzọ, site n'iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri.

16. Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.

17. O we me ka m'bata n'ogige di n'èzí, ma, le, ime-ulo di iche iche na pavement di, nke emeworo nye ogige ahu buruburu n'akuku nile: orú ime-ulo na iri di na pavement ahu.

18. Pavement ahu di kwa n'akuku ọnu-uzọ-ama nile, na nso ogologo nke ọnu-uzọ-ama, bú pavement nke dikari ala.

19. O we tùa obosara-ya site n'iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n'èzí, ọgu cubit ise, n'akuku Iru-anyanwu na n'akuku Ugwu.

20. Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n'uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n'èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya.

21. Ime-ulo-ya di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile di ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama mbu: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.

22. Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha.

23. Otù ọnu-uzọ-ama di-kwa-ra ogige di nime na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama ọzọ, n'akuku Ugwu na n'akuku Iru-anyanwu; o we tùa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ, ọgu cubit ise.

24. O we me ka m'je n'uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n'uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 40