Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 40:46-49 Bible Nso (IGBOB)

46. Ma ime-ulo a nke iru-ya di n'uzọ Ugwu diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjà: ndia bu umu Zedok, ndi si n'etiti umu Livai abiakute Jehova nso ijere Ya ozi.

47. O we tùa ogige ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise, obosara-ya di kwa ọgu cubit ise, o nwere akuku anọ ra nrata; ebe-ichu-aja di kwa n'iru ulo ahu.

48. O we me ka m'biarue uzọ-nbata nke ulo ahu, o we tùa akuku-ọnu-uzọ nke uzọ-nbata ahu, cubit ise n'otù akuku, cubit ise n'akuku nke-ọzọ: obosara ọnu-uzọ-ama di kwa cubit atọ n'otù akuku, cubit atọ n'akuku nke-ọzọ.

49. Ogologo uzọ-nbata ahu di orú cubit, obosara-ya di kwa cubit iri na otù; ọbuná n'ihe-nrigo ahu nke ha ji arigo ya: ogidi di kwa n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua, otù n'otù akuku, otù n'akuku ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 40