Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 36:7-22 Bible Nso (IGBOB)

7. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem eweliwo akam elu, si, N'ezie mba nile ndi di unu buruburu, ha onwe-ha gēbu ọnọdu-ihere-ha.

8. Ma unu onwe-unu, ugwu Israel, ngalaba-unu ka unu gāwaputa, miara ndim, bú Israel, nkpuru-unu; n'ihi na ha nọ nso ibia.

9. N'ihi na, le, Mu onwem diri unu, M'gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe:

10. M'gēme kwa ka madu ba uba n'elu unu, bú ulo Israel nile, ha nile: madu gēbi kwa n'obodo-unu nile, ọ bu kwa nkpọnkpọ ebe nile unu ka agēwu:

11. M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12. M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.

13. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo;

14. n'ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta);

15. M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16. Okwu Jehova we ruem nti, si,

17. Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n'elu ala-ha, ha we merua ya site n'uzọ-ha, site kwa n'omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n'irum.

18. M'we wukwasi ha ọnumam n'ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n'ala-ha, na n'ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya:

19. M'we chusa ha n'etiti mba nile, ha we b͕asa n'ala nile: dika uzọ-ha si di, na dika omume nile ha si di, otú a ka M'kpere ha ikpe.

20. Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta.

21. Ma enwerem ọmiko n'aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, ebe ha biara.

22. N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 36