Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 36:5-18 Bible Nso (IGBOB)

5. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ezie n'ọku nke ekworom ka M'kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n'ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n'agha:

6. n'ihi nka bue amuma bayere ala Israel, si ugwu-ya nile, si kwa ugwu ntà ya nile, si ebe-ya nile miri si erù, si kwa ndagwurugwu-ya nile, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Lem anya, n'ekworom na n'ọnumam ka M'kwuworo okwu, n'ihi na ọ bu ọnọdu-ihere nke mba di iche iche ka unu būruworo:

7. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem eweliwo akam elu, si, N'ezie mba nile ndi di unu buruburu, ha onwe-ha gēbu ọnọdu-ihere-ha.

8. Ma unu onwe-unu, ugwu Israel, ngalaba-unu ka unu gāwaputa, miara ndim, bú Israel, nkpuru-unu; n'ihi na ha nọ nso ibia.

9. N'ihi na, le, Mu onwem diri unu, M'gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe:

10. M'gēme kwa ka madu ba uba n'elu unu, bú ulo Israel nile, ha nile: madu gēbi kwa n'obodo-unu nile, ọ bu kwa nkpọnkpọ ebe nile unu ka agēwu:

11. M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

12. M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.

13. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo;

14. n'ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta);

15. M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

16. Okwu Jehova we ruem nti, si,

17. Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n'elu ala-ha, ha we merua ya site n'uzọ-ha, site kwa n'omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n'irum.

18. M'we wukwasi ha ọnumam n'ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n'ala-ha, na n'ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 36