Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 35:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.

7. M'gēme kwa ugwu Sia ka ọ ghọ ihe-iju-anya na ebe tọb͕ọrọ n'efu; M'gēbipu kwa nime ya onye nāgabiga na onye nālaghachi.

8. M'gēmeju kwa ugwu-ya nile na ndi-ya eb͕uru eb͕u: ugwu ntà gi nile na ndagwurugwu-gi nile na ebe-gi nile miri si erù, ndi ejiri mma-agha b͕u gāda nime ha.

9. Ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme gi ka i ghọ, madu agaghi-ebi kwa n'obodo-gi nile: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

10. N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu:

11. n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), M'gēme kwa dika iwe-gi si di, na dika ekworo-gi si di nke i kwoworo site n'asì i kpọrọ ha; Mgēme kwa ka amara Mu onwem n'etiti ha, mb͕e M'gēkpe gi ikpe.

12. I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha.

13. Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.

14. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: ka ọṅù nke uwa nka nile ra, otú a ka M'gēme gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 35