Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 35:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, che iru-gi imegide ugwu Sia, bue amuma megide ya,

3. si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, ugwu Sia, M'gēseti kwa akam imegide gi, M'gēme kwa ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya.

4. Obodo-gi nile ka M'gēme ka ha ghọ nkpọnkpọ ebe, gi onwe-gi gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

5. N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:

6. n'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie nání ọbara ka M'gēme gi ka i ghọ, ọbara ganāchu kwa gi: ọ bu ezie na i kpọghi ọbara asì, ma ọbara gāchu gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 35