13. Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.
14. Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;
15. asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.