Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 31:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ we ma nma n'idi-uku-ya, n'ogologo nke alaka-ya nile: n'ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n'ebe ọtutu miri di.

8. Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya.

9. Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.

10. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;

11. M'gēnye kwa ya n'aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n'ihi nmebi-iwu-ya ka M'chupuworo ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 31