Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 28:2-12 Bible Nso (IGBOB)

2. Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:

3. le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi:

4. i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n'àkù-gi nile:

5. i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n'ihi àkù-gi:

6. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i doworo obi-gi ka obi Chineke,

7. n'ihi nka, le, M'gēme ka ndi ala ọzọ biakwasi gi, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji: ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide ima-nma nke amam-ihe-gi, me ka onwunwu-ìhè-gi ghara idi nsọ.

8. Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n'etiti oké osimiri nile.

9. Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.

10. Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11. Okwu Jehova we ruem nti, si,

12. Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 28