Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 23:40-49 Bible Nso (IGBOB)

40. Ọzọ kwa, unu nēziga ikpọ ndikom ndi nēsi n'ebe di anya bia: bú ndi ezigaworo onye-ozi, ma, le, ha biara; ndi i sara aru n'ihi ha, de ihe n'anya-gi abua, chiri ihe-ichọ-nma chọ onwe-gi nma,

41. nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya.

42. Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha.

43. M'we kwue okwu bayere nwanyi ahu kara nká n'ikwa-iko-ya nile, si, Ub͕u a ka ha gākwa iko nile ọ nākwa, ya onwe-ya gākwa kwa iko.

44. Ha we bakuru ya, dika madu si abakuru nwanyi nākwa iko: otú a ka ha bakuru Ohola, bakuru kwa Oholiba, bú ndinyom ahu nēzube ajọ ihe.

45. Ma ndi ezi omume, ha onwe-ha gēkpe ha ikpe nke ndinyom nākwa iko na ikpé nke ndinyom nāwusi ọbara; n'ihi na ndinyom nākwa iko ka ha bu, ọbara di kwa n'aka-ha.

46. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka nkpọkọta madu rigota imegide ha, M'gēwere kwa ha nye ka ha ghọ ihe-ntughari na ihe-nluta-n'agha.

47. Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n'ọku.

48. M'gēme kwa ka ajọ nzube kwusi n'ala-unu, ka ewe dọ ndinyom nile aka na nti, ha ewe ghara ime dika ajọ nzube-unu si di.

49. Ha gētiyekwasi kwa unu ajọ nzube-unu, ọ bu kwa nmehie nile nke arusi nile unu ka unu gēbu: unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 23