Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n'ọku.