Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 22:24-29 Bible Nso (IGBOB)

24. Nwa nke madu, si ya, Gi onwe-gi bu ala nke anēmeghi ka ọ di ọcha, miri ezokwasighi ya n'ubọchi ajọ iwe.

25. Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya.

26. Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.

27. Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.

28. Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.

29. Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 22