Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 22:18-29 Bible Nso (IGBOB)

18. Nwa nke madu, ulo Israel aghọworom afuru-uzu: ha nile bu ọla na b͕amb͕am na ígwè na opù, n'etiti oké ọku; afuru-uzu nke ọla-ọcha ka ha ghọworo.

19. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta unu n'etiti Jerusalem.

20. Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n'etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M'gāchikọta unu n'iwem na n'ọnumam, tọb͕ọ unu n'ebe ahu, b͕aze unu.

21. E, M'gākpọkọta unu, were ọku nke nrubiga-ókè nke iwem fukwasi unu, unu ewe b͕aze n'etiti ya.

22. Dika esi ab͕aze ọla-ọcha n'etiti oké ọku, otú a ka agāb͕aze unu n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, awukwasiwo unu ọnumam.

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, si ya, Gi onwe-gi bu ala nke anēmeghi ka ọ di ọcha, miri ezokwasighi ya n'ubọchi ajọ iwe.

25. Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya.

26. Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.

27. Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.

28. Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.

29. Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 22