Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 19:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

7. O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya.

8. Mba nile we si n'ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n'aru ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya.

9. Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.

10. Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri.

11. O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n'etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n'idi-elu-ya n'iba-uba nke alaka-ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 19