Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:50-58 Bible Nso (IGBOB)

50. Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya.

51. Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n'ihe-árú-gi nile nke i meworo.

52. Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.

53. M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha:

54. Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi.

55. Umu-nne-gi ndinyom, bú Sọdọm na umu-ya ndinyom, gēchighata n'ọnọdu mb͕e ochie ha, Sameria na umu-ya ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie ha, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom gēchighata kwa n'ọnọdu mb͕e ochie unu.

56. Ma Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, abughi aha anuru n'ọnu-gi n'ubọchi npako-gi;

57. tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu.

58. Ajọ ihe-nzube-gi na ihe-árú-gi nile ka gi onwe-gi buruworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16