Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:49-51 Bible Nso (IGBOB)

49. Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.

50. Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya.

51. Sameria kwa, ọ bughi ka nkera nke nmehie-gi nile ra ka o meworo; i we me ka ihe-árú-gi ba uba kari nke ha, i we gua umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume site n'ihe-árú-gi nile nke i meworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16