Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 16:34-42 Bible Nso (IGBOB)

34. Gi na ndinyom ọzọ we di iche n'ikwa-iko-gi nile otú a, na ọ dighi onye nākwaso gi iko: na ebe i nēnye onyinye, ma ọ dighi onyinye enyeworo gi, i we ghọ onye di iche.

35. N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:

36. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;

37. n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.

38. M'gēkpe kwa gi ikpe nile nke ndi bu nwunye nākwa iko, ndi nāwusi kwa ọbara; M'gēwere kwa gi nye ka i buru ọbara nke ọnuma na nke ekworo.

39. M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.

40. Ha gēme kwa ka nkpọkọta rigota imegide gi, ha gēwere kwa nkume tub͕ue gi, were mma-agha-ha dupue gi.

41. Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.

42. M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 16