Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 15:6-8 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem.

7. M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.

8. M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 15