Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 13:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. Otú a ka M'gēmezu ọnumam n'aru mb͕idi ahu na n'aru ndi teworo ya nzu; M'gāsi kwa unu, Mb͕idi ahu adighi, ndi nēte ya adighi kwa;

16. bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, do iru-gi imegide umu-ndinyom nke ndi-gi, ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta; gi bue amuma megide ha,

18. si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n'elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu?

19. Unu we me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ndim n'ihi nju-aka ọka barley na n'ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n'okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha.

20. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide ohiri-isi nile unu, nke unu onwe-unu ji achu ntá nkpuru-obi madu n'ebe ahu dika anu-ufe, M'gādọwapu kwa ha n'ogwe-aka-unu; M'gēzilaga kwa nkpuru-obi nile, bú nkpuru-obi unu onwe-unu nāchu ntá dika anu-ufe.

21. M'gādọwa kwa ákwà-nb͕okwasi nile unu, naputa ndim n'aka-unu, ha agaghi-adi kwa n'aka-unu ọzọ ichu ntá ha; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

22. N'ihi na unu ji okwu-ugha mebie obi onye ezi omume, ma Mu onwem emeghi ka o b͕ue ya nb͕u; na n'ihi na unu mere ka aka abua nke onye nēmebi iwu di ike, ka o we ghara isi n'uzọ ọjọ ya lata, ime ka ọ di ndu:

23. n'ihi nka unu agaghi-ahu kwa ọhù efu ọzọ, unu agaghi-aju kwa ase ọzọ: M'gānaputa kwa ndim n'aka-unu; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 13