Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 13:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a; M'gēwere kwa oké ifufe b͕awa ya n'ọnumam; oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo kwa n'iwem, na oké ákú-miri-ígwé n'ọnumam ime ka ọ gwusia.

14. M'gākwatu kwa mb͕idi ahu nke unu teworo nzu, M'gēme kwa ka ọ darue ala, ewe kpughepu ntọ-ala-ya: ọ gāda kwa, agēme kwa ka unu gwusia n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

15. Otú a ka M'gēmezu ọnumam n'aru mb͕idi ahu na n'aru ndi teworo ya nzu; M'gāsi kwa unu, Mb͕idi ahu adighi, ndi nēte ya adighi kwa;

16. bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

17. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, do iru-gi imegide umu-ndinyom nke ndi-gi, ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta; gi bue amuma megide ha,

18. si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n'elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 13