Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 7:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Eze na Heman we bata iso Esta, bú nwunye eze, ṅu manya-vine.

2. Eze we si kwa Esta n'ubọchi nke-abua, n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.

3. Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n'aririọm, na ndim n'ọchichọm:

4. n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.

5. Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?

6. Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n'iru eze na nwunye eze.

7. Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 7