Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 9:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala.

10. Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n'iru ayi n'akuku ọ bula.

11. N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;

12. ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka.

13. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.

14. M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.

15. M'gāku kwa ha n'elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n'ala-ha nke M'nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Emos 9