Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 9:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?

8. Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala.

10. Site na mma-agha ka ndi-nmehie nile nke ndim gānwu, ndi nāsi, Ihe ọjọ ahu agaghi-erute ayi aru, ọ gaghi-abia kwa n'iru ayi n'akuku ọ bula.

11. N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;

12. ka ha we nweta ndi Edom fọduru, na mba nile ndi akpọkwasiri aham; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēme nka.

13. Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.

14. M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.

15. M'gāku kwa ha n'elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n'ala-ha nke M'nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Emos 9