Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 2:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:

2. ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike:

3. M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.

4. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:

5. ma M'gēzite ọku na Juda, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Jerusalem.

6. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Israel, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha reworo onye ezi omume n'ọla-ọcha, re kwa ob͕eye n'ihi akpukpọ-ukwu abua:

7. ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Emos 2