Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 8:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.

12. Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:

13. ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke.

14. Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu.

15. Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 8