Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 5:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n'ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n'ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ.

2. Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole.

3. N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 5