Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 5:29-33 Bible Nso (IGBOB)

29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!

30. Je, si ha, Laghachirinu onwe-unu n'ulo-ikwū-unu.

31. Ma gi onwe-gi, guzo n'ebe a n'akukum, ka M'gwa kwa gi ihe ahu nile M'nyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n'ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya.

32. Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

33. N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 5