15. I gēcheta kwa na i buri orù n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, were aka di ike, were kwa ogwe-aka eseteri eseti, me ka i si n'ebe ahu puta: n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu idebe ubọchi-izu-ike.
16. Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
17. Gi eb͕ula madu.
18. Gi akwa-kwa-la iko.
19. Gi ezu-kwa-la ori.
20. Gi ab͕a-kwa-la àmà ugha megide madu-ibe-gi.
21. Gi enwe-kwa-la anya-uku n'ebe nwunye madu-ibe-gi nọ; agu ulo madu-ibe-gi agu-kwa-la gi, ma-ọbu ubi-ya, ma-ọbu orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ma-ọbu ehi-ya, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ma-ọbu ihe ọ bula nke madu-ibe-gi nwere.
22. Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.
23. O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n'etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu;
24. unu we si, Le, Jehova, bú Chineke-ayi, emewo ka ayi hu ebube-Ya na idi-uku-Ya, ọ bu kwa olu-Ya ka ayi nuru site n'etiti ọku ahu; ta ka ayi huworo na Chineke nākpayere madu uka, ọ di kwa ndu.
25. Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka ayi gānwu? n'ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa.
26. N'ihi na ònye di n'etiti anu-aru nile, nke nuworo olu Chineke di ndu ka O nēkwu okwu site n'etiti ọku, dika ayi nuru, ọ di kwa ndu?
27. Gi onwe-gi jerue nso, nu kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gēkwu: gi onwe-gi gāgwa kwa ayi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāgwa gi; ayi gānu kwa, me ya.
28. Jehova we nu olu okwu nile unu, mb͕e unu gwaram okwu; Jehova we sim, Anuwom olu okwu nile nke ndi nka, nke ha gwaworo gi: ha emewo nke-ọma n'ihe nile ha kwuworo.
29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!
30. Je, si ha, Laghachirinu onwe-unu n'ulo-ikwū-unu.
31. Ma gi onwe-gi, guzo n'ebe a n'akukum, ka M'gwa kwa gi ihe ahu nile M'nyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n'ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya.
32. Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.