4. Iwu ka Moses nyere ayi,Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.
5. Ọ we buru eze nime Jeshurun,Mb͕e ndi-isi ndi Israel chikọtara onwe ha,Ebo nile nke Israel n'otù.
6. Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu;Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.
7. Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si,Jehova, nu olu Juda,Me kwa ka ọ bakute ndi-ya:Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù;Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.
8. Ọ we kwue ihe bayere Livai, si,Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi,Onye I nwara na Masa,Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;