Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 33:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ we kwue ihe bayere Gad, si,Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara:Dika nne-ọdum ka ọ nēbi,Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.

21. Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu,N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu;Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia,Ezi omume nke Jehova ka o mere,Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.

22. O we kwue ihe bayere Dan, si,Dan bu nwa ọdum,Ọ nēsi na Beshan maputa.

23. O we kwue ihe bayere Naftali, si,Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi,Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova:Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.

24. O we kwue ihe bayere Asha, si,Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu;Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ,Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu.

25. Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu;Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.

26. Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun,Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka,Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya.

27. Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu,N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa:Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi,We si, Kpochapu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 33