Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 32:28-41 Bible Nso (IGBOB)

28. N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.

29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!

30. Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?

31. N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.

32. N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,Site kwa n'ubi Gọmọra:Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,Uyọkọ di ilu ka ha nwere:

33. Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,Na ńsí di irè nke aju-ala.

34. Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?

35. Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.

36. N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.

37. Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;

38. Nke nēri abuba àjà nile ha,Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;Ka ha bilie, yere unu aka,Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.

39. Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.

40. N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,

41. Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,O buru kwa na akam ejide ikpé;M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 32