Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 31:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu.

6. Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.

7. Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.

8. Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

9. Moses we de iwu a n'akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel.

10. Moses we nye ha iwu, si, N'ọgwugwu arọ asa, na mb͕e akara àkà nke arọ nrapu ahu, n'ememe ulo-ntu,

11. mb͕e Israel nile gābia ka ahu ha anya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa, i gāgu iwu a n'iru Israel nile na nti-ha.

12. Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a;

13. umu-ha, ndi nāmaghi, gānu kwa, we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ebe unu nāgabiga Jọdan inweta ya.

14. Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n'ulo-ikwū nzute, ka M'we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n'ulo-ikwū nzute.

15. Ewe hu Jehova anya n'Ulo-ikwū ahu n'ogidi igwe-oji: ogidi igwe-oji ahu we guzo n'elu ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 31