Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 31:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Moses we je gwa Israel nile okwu ndia.

2. Ọ we si ha, Ọgu arọ isi ka m'b͕ara ta; apughm ipu apu na ibata abata ọzọ: Jehova asiwokwam, I gaghi-agabiga Jọdan nka.

3. Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, Ya onwe-ya gēkpochapu mba ndia n'iru gi, i gēnweta kwa ha: Joshua, ya onwe-ya nāgabiga n'iru gi, dika Jehova kwuworo.

4. Jehova gēme kwa ha dika O mere Saihon, me kwa Og, bú ndi-eze ndi-Amorait, me kwa ala-ha; ndi O kpochapuru.

5. Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu.

6. Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.

7. Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.

8. Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 31