Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 3:20-28 Bible Nso (IGBOB)

20. rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu.

21. Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga.

22. Unu atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha.

23. M'we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si,

24. Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di?

25. Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.

26. Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli.

27. Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.

28. Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 3