Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 28:16-27 Bible Nso (IGBOB)

16. Onye anābu ọnu ka i gābu n'obodo, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọhia.

17. Ihe anābu ọnu ka abọ-gi na ihe-gi iji gwọ achicha gābu.

18. Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.

19. Onye anābu ọnu ka i gābu na nbata-gi, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọpupu-gi.

20. Jehova gēzikwasi gi ọbubu-ọnu, na ob͕ub͕a-aghara, na ibasi-nba-ike, nime nseti aka-gi nile nke i nēme, rue mb͕e agēkpochapu gi, ru kwa mb͕e i gāla n'iyì ngwa ngwa; n'ihi ihe ọjọ nke omume-gi nile nke i ji rapum.

21. Jehova gēme ka ajọ ọria nke nēfe efe rapara n'aru-gi, rue mb͕e Ọ gēme ka i gwupu n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

22. Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.

23. Elu-igwe-gi nke di n'elu isi-gi gābu kwa ọla, ala nke di n'okpuru gi gābu kwa ígwè.

24. Jehova gēme ka miri-ozuzo nke ala-gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n'elu-igwe dakwasi gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.

25. Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.

26. Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.

27. Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 28