Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 26:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya;

2. na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.

3. I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi.

4. Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi.

5. I gāza kwa, si n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n'iyì ka nnam bu, o we rida n'Ijipt, nọ dika ọbìa n'ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n'ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba:

6. ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n'ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike:

7. ayi we tikue Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, Jehova we nu olu-ayi, hu kwa nweda-n'ala-ayi, na ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, na nmeb͕u-ayi:

8. Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n'Ijipt puta:

9. O we me ka ayi bata n'ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

10. Ma ub͕u a, le, ewetawom nkpuru mbu nke nkpuru ala-ubi nke I nyeworom, Jehova. I gādọba kwa ya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, kpọ isi ala n'iru Jehova, bú Chineke-gi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 26