Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 21:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n'elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu.

7. Ha gāza kwa, si, Aka-ayi awusighi ọbara nka, anya-ayi ahughi kwa ya.

8. Jehova, kpuchiere ndi-Gi nmehie-ha, bú Israel, nke I b͕aputaworo, ekwela ka ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ di n'etiti ndi-Gi, bú Israel. Agēkpuchi-kwa-ra ha nmehie ọbara ahu.

9. Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n'etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

10. Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n'aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n'agha n'agha,

11. i we hu nwayi nke mara nma n'aru n'usu ndi adọtara n'agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye;

12. i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya,

13. yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye.

14. O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n'ego ma-ọli, emela ya dika orù, n'ihi na i wedawo ya n'ala.

15. Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;

16. ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara:

17. kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.

18. Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 21