isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n'ọhia n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya:

2. ndi-okenye-gi na ndi-ikpé-gi gāputa kwa, tùrue obodo nile nke di buruburu onye ahu eb͕uru eb͕u:

3. ọ gēru kwa, na obodo ahu nke dikachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, ndi-okenye obodo ahu gēwere kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi, nke akējighi ya lu ọlu-ubi, nke akādọghi kwa ihe nime yoke;

4. ndi-okenye obodo ahu gākpudata nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nime ndagwurugwu miri nērù mbe nile, nke anālughi ọlu-ubi, nke anāghaghi kwa nkpuru nime ya, ha gāb͕aji kwa olu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu n'ebe ahu nime ndagwurugwu ahu:

5. ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:

6. ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n'elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu.

7. Ha gāza kwa, si, Aka-ayi awusighi ọbara nka, anya-ayi ahughi kwa ya.

8. Jehova, kpuchiere ndi-Gi nmehie-ha, bú Israel, nke I b͕aputaworo, ekwela ka ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ di n'etiti ndi-Gi, bú Israel. Agēkpuchi-kwa-ra ha nmehie ọbara ahu.

9. Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n'etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

10. Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n'aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n'agha n'agha,

11. i we hu nwayi nke mara nma n'aru n'usu ndi adọtara n'agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye;

12. i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya,

13. yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye.

14. O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n'ego ma-ọli, emela ya dika orù, n'ihi na i wedawo ya n'ala.

15. Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;

16. ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara:

17. kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.

18. Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti:

19. nna-ya na nne-ya gējide kwa ya aka, me ka ọ pukuru ndi-okenye obodo-ya, we rue ọnu-uzọ-ama ebe nke ya;

20. ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n'olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè.

21. Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.

22. Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi;

23. ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.