Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 21:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru;

16. ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara:

17. kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.

18. Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti:

19. nna-ya na nne-ya gējide kwa ya aka, me ka ọ pukuru ndi-okenye obodo-ya, we rue ọnu-uzọ-ama ebe nke ya;

20. ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n'olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè.

21. Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.

22. Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi;

23. ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 21