Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 16:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu.

5. I pughi ichu àjà ngabiga n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi:

6. kama n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n'ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n'anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n'Ijipt puta.

7. I gēsi kwa ya rie ya n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n'ututu, je n'ulo-ikwu-gi nile.

8. Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya.

9. Izù asa nke ubọchi asa ka i gāguru onwe-gi: site na mb͕e i nāmalite itiye mma-iwe-ihe-ubi nime ọka guzoro eguzo ka i gāmalite igu izù asa nke ubọchi asa.

10. I gēme-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe nke izù asa nke ubọchi asa, dika ọtùtù nke onyinye-afọ-ofufo nke aka-gi si di, nke i gēnye, dika Jehova, bú Chineke-gi, nāgọzi gi:

11. i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.

12. I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'Ijipt: i gēdebe kwa me kwa ukpuru ndia.

13. I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n'ebe-nzọcha-ọka-gi na n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi:

14. i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

15. Ubọchi asa ka i gēmere Jehova, bú Chineke-gi, ememe n'ebe ahu nke Jehova gārọputa: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'ihe-ọmume-gi nile, na n'omume nile nke aka-gi, i gābu kwa onye nāṅuri nání ọṅu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 16